Native Bible

Exodus 21:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.

Exodus 21:14 in English

Exodus 21:14 · Berean Standard Bible

But if a man schemes and acts willfully against his neighbor to kill him, you must take him away from My altar to be put to death.

Context

12“Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ. 13Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ. 14Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya. 15“Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ. 16“Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.