Ọpụpụ 2:17
Exodus 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.
Exodus 2:17 in English
Exodus 2:17 · Berean Standard Bible
And when some shepherds came along and drove them away, Moses rose up to help them and watered their flock.
Context
15Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia.* Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri. 16Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri. 17Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri. 18Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel,* onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?” 19Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.