Native Bible

Exodus 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo,* si otu a, dọtara unu onwe m.

Exodus 19:4 in English

Exodus 19:4 · Berean Standard Bible

‘You have seen for yourselves what I did to Egypt, and how I carried you on eagles’ wings and brought you to Myself.

Context

2Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. 3Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: 4‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo,* si otu a, dọtara unu onwe m. 5Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, 6ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.