Native Bible

Exodus 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel:

Exodus 19:3 in English

Exodus 19:3 · Berean Standard Bible

Then Moses went up to God, and the LORD called to him from the mountain, “This is what you are to tell the house of Jacob and explain to the sons of Israel:

Context

1Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. 2Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. 3Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: 4‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo,* si otu a, dọtara unu onwe m. 5Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.