Ọpụpụ 19:22
Exodus 19:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”
Exodus 19:22 in English
Exodus 19:22 · Berean Standard Bible
Even the priests who approach the LORD must consecrate themselves, or the LORD will break out against them.”
Context
20Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke. 21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi. 22Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.” 23Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ” 24Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.