Native Bible

Exodus 19:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke.

Exodus 19:20 in English

Exodus 19:20 · Berean Standard Bible

The LORD descended to the top of Mount Sinai and called Moses to the summit. So Moses went up,

Context

18Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ. 19Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe. 20Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke. 21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi. 22Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.