Ọpụpụ 18:9
Exodus 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
Exodus 18:9 in English
Exodus 18:9 · Berean Standard Bible
And Jethro rejoiced over all the good things the LORD had done for Israel, whom He had rescued from the hand of the Egyptians.
Context
7Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha. 8Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha. 9Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt. 10Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero. 11Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.