Native Bible

Exodus 18:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.”

Exodus 18:23 in English

Exodus 18:23 · Berean Standard Bible

If you follow this advice and God so directs you, then you will be able to endure, and all these people can go home in peace.”

Context

21Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi* asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri. 22Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe. 23Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.” 24Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru. 25O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.