Ọpụpụ 18:22
Exodus 18:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe.
Exodus 18:22 in English
Exodus 18:22 · Berean Standard Bible
Have these men judge the people at all times. Then they can bring you any major issue, but all minor cases they can judge on their own, so that your load may be lightened as they share it with you.
Context
20Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ. 21Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi* asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri. 22Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe. 23Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.” 24Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.