Native Bible

Exodus 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Amalek* bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.

Exodus 17:8 in English

Exodus 17:8 · Berean Standard Bible

After this, the Amalekites came and attacked the Israelites at Rephidim.

Context

6Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile. 7Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?” 8Ndị Amalek* bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim. 9Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.” 10Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.