Native Bible

Exodus 17:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”

Exodus 17:14 in English

Exodus 17:14 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Moses, “Write this on a scroll as a reminder and recite it to Joshua, because I will utterly blot out the memory of Amalek from under heaven.”

Context

12Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara. 13Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha. 14Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.” 15Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m. 16Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze Onyenwe anyị dị. Onyenwe anyị ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.” 17:8 Ndị Amalek bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, Jen 36:12 Ha bụ ndị ọjọọ, na-apụnara ndị mmadụ na-aga nʼọzara ihe nʼike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.