Native Bible

Exodus 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.

Exodus 16:6 in English

Exodus 16:6 · Berean Standard Bible

So Moses and Aaron said to all the Israelites, “This evening you will know that it was the LORD who brought you out of the land of Egypt,

Context

4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. 5Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.” 6Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt. 7Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?” 8Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.