Native Bible

Exodus 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”

Exodus 16:5 in English

Exodus 16:5 · Berean Standard Bible

Then on the sixth day, when they prepare what they bring in, it will be twice as much as they gather on the other days.”

Context

3Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.” 4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. 5Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.” 6Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt. 7Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.