Native Bible

Exodus 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”

Exodus 16:12 in English

Exodus 16:12 · Berean Standard Bible

“I have heard the grumbling of the Israelites. Tell them, ‘At twilight * you will eat meat, and in the morning you will be filled with bread. Then you will know that I am the LORD your God.’”

Context

10Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii. 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 12“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ” 13Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel* bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 14Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.