Native Bible

Exodus 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”

Exodus 15:26 in English

Exodus 15:26 · Berean Standard Bible

saying, “If you will listen carefully to the voice of the LORD your God, and do what is right in His eyes, and pay attention to His commands, and keep all His statutes, then I will not bring on you any of the diseases I inflicted on the Egyptians. For I am the LORD who heals you.”

Context

24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” 25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha. 26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.” 27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ. 15:11 Onye ịdị nsọ ya dị ukwuu

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.