Ọpụpụ 15:25
Exodus 15:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
Exodus 15:25 in English
Exodus 15:25 · Berean Standard Bible
And Moses cried out to the LORD, and the LORD showed him a log. And when he cast it into the waters, they were sweetened. There the LORD made for them a statute and an ordinance, and there He tested them,
Context
23Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) 24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” 25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ.
Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha. 26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.” 27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.
15:11 Onye ịdị nsọ ya dị ukwuu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.