Native Bible

Exodus 14:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.

Exodus 14:2 in English

Exodus 14:2 · Berean Standard Bible

“Tell the Israelites to turn back and encamp before Pi-hahiroth, between Migdol and the sea. You are to encamp by the sea, directly opposite Baal-zephon.

Context

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 3Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’ 4Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.