Ọpụpụ 12:24
Exodus 12:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
Exodus 12:24 in English
Exodus 12:24 · Berean Standard Bible
And you are to keep this command as a permanent statute for you and your descendants.
Context
22Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ. 23Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu. 24“Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu. 25Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe* a. 26Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.