Native Bible

Exodus 12:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.

Exodus 12:23 in English

Exodus 12:23 · Berean Standard Bible

When the LORD passes through to strike down the Egyptians, He will see the blood on the top and sides of the doorframe and will pass over that doorway; so He will not allow the destroyer to enter your houses and strike you down.

Context

21Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a. 22Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ. 23Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu. 24“Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu. 25Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe* a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.