Ọpụpụ 11:8
Exodus 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
Exodus 11:8 in English
Exodus 11:8 · Berean Standard Bible
And all these officials of yours will come and bow before me, saying, ‘Go, you and all the people who follow you!’ After that, I will depart.” And hot with anger, Moses left Pharaoh’s presence.
Context
6Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ. 7Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt. 8Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta. 9Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.” 10Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.
11:5 Gbaa gburugburu ala niile dị nʼetiti ọwụwa anyanwụ, ọdịnihu ezinaụlọ ọbụla na-adabere nʼọkpara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.