Native Bible

Exodus 10:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.”

Exodus 10:28 in English

Exodus 10:28 · Berean Standard Bible

“Depart from me!” Pharaoh said to Moses. “Make sure you never see my face again, for on the day you see my face, you will die.”

Context

26Igwe anụ ụlọ anyị ga-esoro anyị. O nweghị ihe ọ bụla anyị ga-ahapụ nʼihi na anyị ga-eji ụfọdụ nʼime ha fee Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Ọ bụkwa naanị mgbe anyị ruru nʼebe ahụ ka anyị nwere ike ịmata ihe anyị ga-eji fee Onyenwe anyị anyị ofufe.” 27Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. O kweghị ka ha laa. 28Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.” 29Mosis zaghachiri Fero sị, “Ihe i kwuru dị mma, agaghị m abịakwa nʼihu gị ọzọ.” 10:11 Nʼusoro ofufe chi ndị Ijipt, ọ bụ naanị ndị ikom na-ahụ ma na-emekwa ihe niile banyere ofufe, ndị inyom na ụmụntakịrị adịghị e sonyere ha. Ihe mere Fero ji na-ekwenyeghị na ndị inyom na ụmụntakịrị ha ga-eso gaa, bụ nʼihi ime ka ndị ikom ha nọgide nʼohu nʼala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.