Ọpụpụ 1:21
Exodus 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
Exodus 1:21 in English
Exodus 1:21 · Berean Standard Bible
And because the midwives feared God, He gave them families of their own.
Context
19Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.” 20Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu. 21Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. 22Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”
1:15 Aha ndị inyom ndị a na-elekọta ndị inyom Hibru ime na-eme, zipụtara nʼebe o doro anya na ha bụ ndị Ijipt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.