Native Bible

Esther 9:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu* dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127).

Esther 9:30 in English

Esther 9:30 · Berean Standard Bible

And Mordecai sent letters with words of peace and truth to all the Jews in the 127 provinces of the kingdom of Xerxes,

Context

28Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile. 29Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim. 30Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu* dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). 31E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme Purim dịka Mọdekai onye Juu na Esta nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị Juu niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ. 32Iwu a Esta nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme Purim ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ. 9:17 Maọbụ, ọnwa iri na abụọ 9:22 Abụ 30:11 9:30 Maọbụ, ịgbaume

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.