Native Bible

Esther 9:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ.

Esther 9:27 in English

Esther 9:27 · Berean Standard Bible

the Jews bound themselves to establish the custom that they and their descendants and all who join them should not fail to celebrate these two days at the appointed time each and every year, according to their regulation.

Context

25Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi. 26Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha. 27Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ. 28Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile. 29Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.