Native Bible

Esther 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.

Esther 8:13 in English

Esther 8:13 · Berean Standard Bible

A copy of the text of the edict was to be issued in every province and published to all the people, so that the Jews would be ready on that day to avenge themselves on their enemies.

Context

11Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha. 12Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada.* 13E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha. 14Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa. 15Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.