Esta 8:12
Esther 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada.*
Esther 8:12 in English
Esther 8:12 · Berean Standard Bible
The single day appointed throughout all the provinces of King Xerxes was the thirteenth day of the twelfth month, the month of Adar.*
Context
10Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka* ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze. 11Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha. 12Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada.* 13E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha. 14Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.