Native Bible

Esther 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses.

Esther 6:2 in English

Esther 6:2 · Berean Standard Bible

And there it was found recorded that Mordecai had exposed Bigthana * and Teresh, two of the eunuchs who guarded the king’s entrance, when they had conspired to assassinate King Xerxes.

Context

1Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya. 2Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses. 3Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!” 4Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.