Native Bible

Esther 6:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.

Esther 6:1 in English

Esther 6:1 · Berean Standard Bible

That night sleep escaped the king; so he ordered the Book of Records, the Chronicles,* to be brought in and read to him.

Context

1Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya. 2Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses. 3Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.