Native Bible

Esther 6:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,

Esther 6:12 in English

Esther 6:12 · Berean Standard Bible

Then Mordecai returned to the king’s gate. But Haman rushed home, with his head covered in grief.

Context

10Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.” 11Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.” 12Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ, 13ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.” 14Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.