Esta 6:11
Esther 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”
Esther 6:11 in English
Esther 6:11 · Berean Standard Bible
So Haman took the robe and the horse, arrayed Mordecai, and paraded him through the city square, crying out before him, “This is what is done for the man whom the king is delighted to honor!”
Context
9Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’ ” 10Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.” 11Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.” 12Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ, 13ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya.
Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.