Esta 2:3
Esther 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.
Esther 2:3 in English
Esther 2:3 · Berean Standard Bible
and let the king appoint commissioners in each province of his kingdom to assemble all the beautiful young women into the harem at the citadel of Susa. Let them be placed under the care of Hegai, the king’s eunuch in charge of the women, and let them be given beauty treatments.
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya. 2Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya. 3Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi. 4Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe. 5Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.