Esta 2:2
Esther 2:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya.
Esther 2:2 in English
Esther 2:2 · Berean Standard Bible
Then the king’s attendants proposed, “Let a search be made for beautiful young virgins for the king,
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya. 2Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya. 3Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi. 4Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.