Native Bible

Esther 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti.

Esther 2:17 in English

Esther 2:17 · Berean Standard Bible

And the king loved Esther more than all the other women, and she found grace and favor in his sight more than all of the other virgins. So he placed the royal crown upon her head and made her queen in place of Vashti.

Context

15Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya. 16E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs. 17Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti. 18Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime. 19Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.