Native Bible

Esther 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya.

Esther 2:15 in English

Esther 2:15 · Berean Standard Bible

Now Esther was the daughter of Abihail, the uncle from whom Mordecai had adopted her as his own daughter. And when it was her turn to go to the king, she did not ask for anything except what Hegai, the king’s trusted official in charge of the harem, had advised. And Esther found favor in the eyes of everyone who saw her.

Context

13Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze. 14A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ. 15Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya. 16E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs. 17Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.