Native Bible

Ephesians 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla,

Ephesians 6:19 in English

Ephesians 6:19 · Berean Standard Bible

Pray also for me, that whenever I open my mouth, words may be given me so that I will boldly make known the mystery of the gospel,

Context

17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. 18Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. 19Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, 20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu. 21Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.