Ndị Efesọs 6:18
Ephesians 6:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.
Ephesians 6:18 in English
Ephesians 6:18 · Berean Standard Bible
Pray in the Spirit at all times, with every kind of prayer and petition. To this end, stay alert with all perseverance in your prayers for all the saints.
Context
16Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. 17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. 18Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. 19Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, 20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.