Native Bible

Ecclesiastes 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.

Ecclesiastes 5:7 in English

Ecclesiastes 5:7 · Berean Standard Bible

For as many dreams bring futility, so do many words. Therefore, fear God.

Context

5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. 6Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị? 7Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke. 8Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha. 9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.