Ekiliziastis 1:17
Ecclesiastes 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
Ecclesiastes 1:17 in English
Ecclesiastes 1:17 · Berean Standard Bible
So I set my mind to know wisdom and madness and folly; I learned that this, too, is a pursuit of the wind.
Context
15Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.
Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ. 16Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.” 17Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe. 18Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,
oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.
1:2 Maọbụ, ihe efu Abụ 144:4.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.