Native Bible

Deuteronomy 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.

Deuteronomy 9:16 in English

Deuteronomy 9:16 · Berean Standard Bible

And I saw how you had sinned against the LORD your God; you had made for yourselves a molten calf. You had turned aside quickly from the way that the LORD had commanded you.

Context

14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.” 15Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m. 16Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ. 17Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu. 18Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.