Diuteronomi 7:18
Deuteronomy 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.
Deuteronomy 7:18 in English
Deuteronomy 7:18 · Berean Standard Bible
But do not be afraid of them. Be sure to remember what the LORD your God did to Pharaoh and all Egypt:
Context
16Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya. 17Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?” 18Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile. 19Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a. 20Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.