Diuteronomi 5:16
Deuteronomy 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Deuteronomy 5:16 in English
Deuteronomy 5:16 · Berean Standard Bible
Honor your father and your mother, as the LORD your God has commanded you, so that your days may be long and that it may go well with you in the land that the LORD your God is giving you.*
Context
14ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. 15Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ. 16Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 17Gị egbula mmadụ. 18Gị akwala iko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.