Diuteronomi 5:13
Deuteronomy 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile,
Deuteronomy 5:13 in English
Deuteronomy 5:13 · Berean Standard Bible
Six days you shall labor and do all your work,
Context
11Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị. 12Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu. 13Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile, 14ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. 15Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.