Native Bible

Deuteronomy 4:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị?

Deuteronomy 4:33 in English

Deuteronomy 4:33 · Berean Standard Bible

Has a people ever heard the voice of God * speaking out of the fire, as you have, and lived?

Context

31Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike. 32Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla. 33O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? 34O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ? 35O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.