Native Bible

Deuteronomy 4:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.

Deuteronomy 4:32 in English

Deuteronomy 4:32 · Berean Standard Bible

Indeed, ask now from one end of the heavens to the other about the days that long preceded you, from the day that God created man on earth: Has anything as great as this ever happened or been reported?

Context

30Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu. 31Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike. 32Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla. 33O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? 34O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.