Native Bible

Deuteronomy 32:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m.

Deuteronomy 32:39 in English

Deuteronomy 32:39 · Berean Standard Bible

See now that I am He; there is no God besides Me. I bring death and I give life; I wound and I heal, and there is no one who can deliver from My hand.

Context

37Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ, bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya, 38chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha, ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ? Ha bilie bịa nyere unu aka! Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!” 39“Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m. 40Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị, dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, 41mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma, mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe, aga m abọ ọbọ megide ndị iro, kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.