Diuteronomi 31:2
Deuteronomy 31:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
Deuteronomy 31:2 in English
Deuteronomy 31:2 · Berean Standard Bible
he said to them, “I am now a hundred and twenty years old; I am no longer able to come and go, and the LORD has said to me, ‘You shall not cross the Jordan.’
Context
1Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile, 2ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 3Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru. 4Onyenwe anyị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.