Native Bible

Deuteronomy 31:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile,

Deuteronomy 31:1 in English

Deuteronomy 31:1 · Berean Standard Bible

When Moses had finished speaking * these words to all Israel,

Context

1Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile, 2ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 3Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.