Native Bible

Deuteronomy 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m akpọku eluigwe na ụwa* taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ

Deuteronomy 30:19 in English

Deuteronomy 30:19 · Berean Standard Bible

I call heaven and earth as witnesses against you today that I have set before you life and death, blessing and cursing. Therefore choose life, so that you and your descendants may live,

Context

17Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, 18agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta. 19Ana m akpọku eluigwe na ụwa* taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ 20ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb. 30:19 Dit 4:26; 8:19

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.