Diuteronomi 29:28
Deuteronomy 29:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
Deuteronomy 29:28 in English
Deuteronomy 29:28 · Berean Standard Bible
The LORD uprooted them from their land in His anger, rage, and great wrath, and He cast them into another land, where they are today.’
Context
26Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha. 27Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a. 28Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.” 29Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.
29:11 Nke a bụ ọrụ nleda anya nke ndị bụ ohu na-arụ. Jos 9:21,23,27
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.