Native Bible

Deuteronomy 29:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.

Deuteronomy 29:26 in English

Deuteronomy 29:26 · Berean Standard Bible

They went and served other gods, and they worshiped gods they had not known—gods that the LORD had not given to them.

Context

24Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?” 25Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta. 26Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha. 27Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a. 28Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.